Abu151— Chuku, mgb'obim nech'echiche
Abu 151— Chuku, mgb'obim nech'echiche |
verse 1
Chuku, mgb'obim nech'echiche
Ebere-Gi nile,
Otutọ-ya n'ebube-ya
N'ebulite obim.
verse 2
Nkasi anapugh'iguta
Ka nchebe nro-I nyere,
Tutu obi nwatam mara
Ebe ha si puta.
verse 3
Mgbe uzo nyerem nsọgbu n'aru,
M'naga nechegh uche,
Aka-I na nzuzo cheberem
Rue mgbe m'tolitere.
verse 4
Mgb'oria nyerem nsọgbu n'aru,
I bu Onye gworom;
Mgbe m'no na njọ n'ahuhu, Gi
Wer'amara tutem.
verse 5
Mgbe nile m'nadi ndu n'uwa,
Idi-nma-I ka m'geso;
Mgbe m'nwuru, la n'uwa ozo,
M'gabu ab'otuto.
verse 6
Na ndu ebigh-ebi n'igwé
M'gekele Gi n'abu;
M'ebigh-ebi agagh-ezu
Itozu otuto-I. Amen.
Abu151— Chuku, mgb'obim nech'echiche
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com