Abu 89- Nna k'ala-eze-Gi bia.
Verse 1
Nna k'ala-eze-Gi bia,
K'Ọ nabia n'ike di ndu;
Kwue okwu ikp'azu-Gi,
Webata oge nmeri.
Verse 2
Dik'o biara na mgb'ochie
Nim'al'obi nke madu,
Mgbe ndi ọma nwuru Gi-
Chineke, k'o bia ozo !
Verse 3
Wep'och'eze nk' Ekwensu,
Kpop'arusi n'obe-ha;
Chiba chichi ka nma,
Kpube okpu-eze-Gi.
Verse 4
Otut'aro gar'aga
K'I zir'anyi ekpere nka;
Any anile neche nche
Ihu ihè-Gi nenwu.
Verse 5
Ka chi nke Chineke bo !
Obi-anyi we nuria'onu;
obi'utọ n'abu di, nsọ
Gekele obubo-ya.
Verse 6
K'Och'eze na mba nile
Buru ndi Chineke nwe;
Nim'obi nke madu dum,
Nna, k'ala-eze-Gi bia ! Amen.
Abu 89- Nna k'ala-eze-Gi bia.
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com