Abu 75- Nyawaram achicha
Abu 75- Nyawaram achicha |
Verse 1
Nyawaram achicha
Nke ndu, Chuku,
Dika I si ke nri
N'uso miri.
M'nachọ Gi, Onye-nwem,
N'Akwukwo nsọ;
Agu Gi nagu mom,
Okwu di ndu.
Verse 2
Gi bu nri nenye ndu,
Gi Onye-nwem;
Ezi-okwu nsọ-Gi
Nazọputam.
Nyem ka m'rie we di ndu
Soro I n'elu;
Zim ka m'hu ez'okwu-I
N'anya, Jisus.
Verse 3
Biko, Nna, Ziterem
Mọ Nsọ-I ugbu a,
K'Ọ met'aka n'anyam
Ka m'huw'uzọ.
Gosim ih'ezoro
Nime Okwu-I
Ka m'hu k'Akwukwo nsọ
Kpughere Gi.
Verse 4
Gozie Okw'om'ahu
N'ebe mu no,
K'I si we gozie nri
Na galili.
Ino n' otru gebi,
Ogba tijie;
Agamahu udo,
G'ihem nile! Amen.
Abu 75- Nyawaram achicha
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com