Abu 38- Ge nti! akuko di ebube.
Verse 1
Ge nti! akuko di ebube!
Ozi'ọma n'ihi mu na gi:
Na Jisus wetar'ayi ngbahara,
Ọ kwusia ugwo-ayi n'obe.
Kọrọs:-
Kwere ya, ony'ojo, kwere Ya;
Nara ozi onu ahu;
Tukwasi obi-gi na Jisus,
Nzọputa k'Ọ nenye gi ta.
Verse 2
Ọ zọput'ayi n'onwu k'ayi di ndu,
Ọ me k'ayi gho umu Chuku;
Otu nsacha di n'ihi ndi-njọ:
Nsacha n'obara nke Jisus.
Verse 3
njọ agagh-enwe ike ozo,
Ọ bu ezie n'o ganwa gi;
N'ihi na Kraist, site n'onwu-Ya,
Gemeb'ike nile nke njọ.
Verse 4
Ugbu a nara ebere Chuku,
Gba oso jeku Jisus ta;
Ọ gakpobata onye biara,
Ọ digh onye Ọ gachupu. Amen.
Abu 38- Ge nti! akuko di ebube
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com