Abu 336- Nna dinsọ, wer'ebere-Gi
Abu 336- Nna dinsọ, wer'ebere-Gi |
Verse 1
Nna dinsọ, wer'ebere-Gi
Nur'aririo-ayi:
Chebe ndi no n'ebe di anya
Na nsọ Gi.
Verse 2
Jisus Kraist, ka nnonyere-Gi
Nedu ha n'ihe;
Debe ha, n'adigh-ike-ha,
N'akuku-I.
Verse 3
N'og' ahuhu, n'og'ize-ndu,
Na nk'idi-nani,
K'ihu-n'anya-Gi nakasi
Ha obi.
Verse 4
Ka onu nke nzọputa-Gi
Buru ike-ha;
Ka ha hu Gi n'anya, to Gi,
Kw'ubọchi.
Verse 5
Mọ Nsọ kwe k'ozizi nke-Gi
Nedo ndu-ha nsọ;
Nye amara-I ka ha merie
Nim'ogu.
Verse 6
Nna, na Ọkpara, na Mọ Nsọ,
Atọ nim'otu,
Gozie, nedu, nedebe ha
Na nsọ Gi. Amen.
Abu 336- Nna dinsọ, wer'ebere-Gi
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com
.Site Credit: 9jainformed.com