Abu 335- N'ihi ndi-ayi no n'eb'ozo
Abu 335- N'ihi ndi-ayi no n'eb'ozo |
Verse 1
N'ihi ndi-ayi no n'eb'ozo
Ayi gabu n'ekpere-ayi:
Wer'ihu-n'anya-Gi di nro
Nke nech'umu-I n'ebe dum,
Nna Nke di nsọ,
Chebe ha na mgbe nile.
Nime onwunwa na nsọgbu,
N'ih'egwu ubọchi dum,
Wer'omiko ebigh-ebi
Narior'obi kpafuru,
Onye-nzot'ayi,
Debe ha n'uzọ di nkpa.
Verse 3
N'oge ujo n'ahuhu-ha,
Mgb'ananwa okwukwe-ha,
Wer'amara-I nke natute
Obi nke Kraist nwururu,
Mọ nk'amara,
Bur'Onye-ndu ha mgbe dum.
Verse 4
Nim'onu n'etiti ndi'enyi,
N'ogu megide nd'iro,
Ka ngọzi-Gi nonyere ha,
K'iru-Gi nye iz'ike,
Chuku d'ike:
Nna, n'Ọkpara, na Mọ Nsọ. Amen.
Abu 335- N'ihi ndi-ayi no n'eb'ozo
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com
.Site Credit: 9jainformed.com