Abu 320- Chineke nk'el'igwé n'ala

Abu 320- Chineke nk'el'igwé n'ala

 Abu 320- Chineke nk'el'igwé n'ala

 

Abu 320- Chineke nk'el'igwé n'ala
 Abu 320- Chineke nk'el'igwé n'ala

Verse 1

Chineke nk'el'igwé n'ala,

Otutọ nile diri Gi!

Ayi gesi ana kele Gi,

Ony'onyinye?


Verse 2

Anwu, na miri, n'ikuku,

Negosi ihu-n'anya-Gi;

I no n'owuwe-ih'ubi,

Ony'onyinye!


Verse 3

N'ihi udo n'aru-ike,

N'ihi ngọzi nile nk'uwa,

Ekele n'otuto diri I,

Ony'onyinye!


Verse 4

I zodogh nani otu Nwa-I

M'I nyere Ya n'ihi uwa

We sor'Onye ngọzi ahu

Nye ihe dum.


Verse 5

Gi nenye onyinye Mọ Nsọ:

Mọ ndu, n'ike, n'ihu-n'anya,

We zokwasi amara Ya

N'elu ayi dum.


Verse 6

N'ihi ndi agbaputara,

N'ihi olil'anya igwé,

Otutọ nile diri Gi,

Ony'onyinye!


Verse 7

Icho nani nk'ayi bu iyi!

Ọ bu aku gadi mgbe dum:-

Ih'obula ayi genye Gi,

Ony'onyinye!


Verse 8

Nna, ayi binye I ih'o bula

I gakwu ayi ugwo nk'ukwu;

Ayi geji obi utọ nye Gi,

Ony'onyinye!


Verse 9

Gi, Onye ayi nesi n'aka I

Nwe ndu ayi n'oninye nile,

K'ayi binyere I ebigh ebi,

Ony'onyinye! Amen.

 Abu 320- Chineke nk'el'igwé n'ala

Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.


We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.

.Site Credit: 9jainformed.com


إرسال تعليق (0)
أحدث أقدم