Abu 307- Uboch'I nyere, Nna, agwuwo
Abu 307- Uboch'I nyere, Nna, agwuwo |
Verse 1
Uboch'I nyere, Nna, agwuwo,
Gi mere k'ochichiri gba;
Gi k'ayi buru ututu,
Otutọ-I gedo ur'ayi nsọ.
Verse 2
Ayi nekele Gi, na Nzuko-Gi,-
K'uwa nagbahari n'ihe,-
Neche nche n'ebe nile n'uwa,
Ghar'izu ike mgb'o bula.
Verse 3
Ka chi ohu nabo nim'ala
Nagw'etiti dum n'usoro,
Onu ekpere adigh-echi,
Otutọ nada mgbe nile.
Verse 4
Anyanwu, nke gwar'ayi zur'ike,
Nakpote ndi bi n'odida;
Oge dum ire ohu neme
K'anuru ebube-I n'elu.
Verse 5
Amen, Ony-nw'ayi! och'eze-Gi
Agagh-ebi dika nk'uwa;
Aleze-Gi di mgb'ebigh-ebi,
Rue mgb'ora madu gefe Gi. Amen.
Abu 307- Uboch'I nyere, Nna, agwuwo
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com
.Site Credit: 9jainformed.com