Abu 299- Obim, teta, so anyanwu
Abu 299- Obim, teta, so anyanwu |
Verse 1
Obim, teta, so anyanwu
Je ozi-gi nk'ubọchi ta;
Rap'ume-ngwu, bilie n'onu,
Kpe ekpere ututu-gi.
Verse 2
Teta, obim, welie onwe-i
Soro ndi-m'ozi n'olu-ha:
Ndi nabu abu n'abali,
Neto Eze ebigh-ebi.
Verse 3
Nekwu ezi'okwu mgbe nile,
K'ako-n'uche-gi di ọcha;
Anya Chineke nahuzu
Ihe-nzuzọ dum nke ndu-gi.
Verse 4
Ka m' to Gi, Onye cheberem
We tute ndum mgbe m'no n'ura;
Kwe, mgbe m'gesi n'onwu bilie,
Ka m'keta ndu ebigh-ebi.
Verse 5
Biko, nedum n'ubọchi ta,
N'okwu, n'uche, n'omume nkem;
Ka ike nile di nimem
Jiko n'otu n'ito nani I.
Verse 6
To Chineke, Onye-ngọzi;
To Ya, ihe nile n'uwa;
To Ya, usu nile nk'igwé;
To Nna, n'Ọkpara, na Mọ Nsọ.
Abu 299- Obim, teta, so anyanwu
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com
.Site Credit: 9jainformed.com