Abu 278- Jisus hur'umu-nta n'anya
Abu 278- Jisus hur'umu-nta n'anya |
Verse 1
Jisus hur'umu-nta n'anya,
Mara olu n'egwu-ha;
Nedu ha ime uche-Ya,
Nanu kwa ekpere-ha;
Umu-ntakiri di ngọzi!
Ọ nanu ekpere-ha!
Verse 2
Jisus necheta umu-nta
Abali n'ehihie dum;
Ned'ukwu-ha ka ha neso
Uzo nke amam-ihe;
Uu-ntakiri di ngọzi!
N'uzọ nke amam-ihe!
Verse 3
Ọ gagozi ma ha rio Ya:
Ọ di nwayọ n'ezi'okwu;
Jisus mara ahuhu-Ya:
Ọ buri nwata na mbu;
Umu-ntakiri di ngọzi!
Ọ buri nwata na mbu! Amen.
Abu 278- Jisus hur'umu-nta n'anya
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com
.Site Credit: 9jainformed.com