Abu 254- Na nso ulọ ka mmadu bi n'ochichi
Abu 254- Na nsọ ulo ka mmadu bi n'ochichi |
Verse 1
Na nsọ ulo ka madu bi n'ọchichi,
Ọtutu ndi nke namagh Jisus Kraist.
Onye geje izisa Ozi Ọma.
Nenwegh nchegbu, nele Jisus anya?
Kọrọs:-
Enyesiwom ike nile!
Enyesiwom ike nile!
Jebenu n'ebe dum, zienu Ozi ọma,
Mu na unu no mgbe nile.
Verse 2
Le, uzọ emeghere nario bia:
Ndi-agha Kraist, ngwa k'ayi ba ha nime!
Ndi Kraist tetanus! k'ayi nile we yiri
Zis'Ozi ọma, topu agbu njọ.
Verse 3
“Unu ganwu?” olu Chineke nakpo;
“Unu gabwu?” k'ayi gaju n'aha-Ya.
Jisus nwuru k'Ọ zọput'ayi n'aj'onwu:
Ganu, zis'Ozi ndu na nzọputa!
Verse 4
K'oge bia ngwa mgbe mba dum gabu abu,
Nasi “Otutọ diri Chineke!”
Mgbe ha ganuri onu nke ngbaputa,
Tie nkpu, “Haleluya, Jisus b'Eze!” Amen.
Abu 254- Na nso ulọ ka mmadu bi n'ochichi
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com