Abu 253- Dibia uku no nsọ ugbu a
Abu 253- Dibia uku no nsọ ugbu a |
Verse 1
Dibia uku no nsọ ugbu a,
Jisus, Onye-ebere;
Okwu-Ya nakasi obi;
Nurunu olu Jisus!
Kọrọs:-
Abu ndi-m'ozi nabu,
Di kw'utọ n'onu madu,
Aha nke kachasi nma;
Jisus, Onye-ngọzi!
Verse 2
Agbaharawo njọ-i nile:
Nuru olu nke Jisus!
Naga n'uzọ igwé n'udo,
Soro Jisus bur'eze.
Verse 3
Otutọ diri Nw'aturu!
Ugbu a ekwem na Jisus;
Ahurum Onye-nwem n'anya,
Aha nke Jisus natom.
Verse 4
Aha-ya nachupu egwum,
Nani Aha nke Jisus;
Ọ nato obim mgbe m'nanu
Aha-ngọzi nke Jisus.
Verse 5
Umu-nna, sorom tobe Ya,
Tobenu Aha Jisus!
Ndinyom, welienu ol'unu,
Gozienu Aha Jisus!
Verse 6
Un'umu-ntakiri nile,
Ndi huru Jisus n'anya,
Gaza oku amara nka,
Ijere Jisus ozi.
Verse 7
Mgbe ayi garigoro n'igwé
Ayi gahu Jisus n'elu;
Ayi gano nsọ och'eze-Ya,
Neto aha nke Jisus! Amen.
Abu 253- Dibia uku no nsọ ugbu a
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com