Abu 248- Anya di nke ura natugh
Abu 248- Anya di nke ura natugh |
Verse 1
Anya di nke ura natugh
N'abali o bula;
Nti di kwa nke nadigh-echi
Mgb'anyanwu dasiri.
Verse 2
Aka di nke ikenagwugh
Mgb'ike madu gwuru;
Ihu-n'anya nadigide
Mgbe nk'uwa jur'oyi.
Verse 3
Any'ahu nele ndi-m'ozi,
Aka nejid'igwé;
Ihu-n'anya nwer'och'eze,
Nti nanu abu nsọ.
Verse 4
Ike di nke madu geji
Mgb'ike uwa b'efu;
Ọ geru nti, n'anya, n'aka,
Na ihu-n'any'ahu.
Verse 5
Ik'ahu b'ekpere; nke si
Na Kraist rue och'eze,
Neme k'aka nke Chineke
Zidata nzọputa! Amen.
Abu 248- Anya di nke ura natugh
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com