Abu 247- Obim, jiker'aririọ-i
Abu 247- Obim, jiker'aririọ-i |
Verse 1
Obim, jiker'aririọ-i,
Jisus naza ekpere;
Ọ bu Ya nasi gi kpe,
Ọ gagh'akpọchi nti ya.
Verse 2
Gi nabiakute Eze,
Bute arirọ n'uba;
N'ih'amara n'ike-Ya
Mad'apugh iriọbiga.
Verse 3
Ibu arọm ka m'ji bia;.
Kraist, wepu ibu njọ nka;.
K'ọbara-I nk'awusiri;.
Sachapum n'ikp'ọmuma;.
Verse 4
Achọrọm izu-ike
Jisus, were nkpur'obim
Nk'I ji ọbara-Gi gba:
Nani I gabu Eze-ya.
Verse 5
Mgbe m'bu ony'ije n'ebe a,
K'ihu-n'anya-I nyem ọṅu;
Dika Onye-ndum n'Eyim
Nedum rue mgb'ijem gagwu.
Abu 247- Obim, jiker'aririọ-i
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com