Abu 244- Nna, Nke si n'ulo-aku-Gi

Abu 244- Nna, Nke si n'ulo-aku-Gi

 Abu 244- Nna, Nke si n'ulo-aku-Gi

Abu 244- Nna, Nke si n'ulo-aku-Gi
Abu 244- Nna, Nke si n'ulo-aku-Gi

Verse 1

Nna, Nke si n'ulo-aku-Gi

Nawukwasi ayi onynye,

Nye ayi ike k'ayi we were

Onyinye-Gi n'uz'ọma.


Verse 2

K'oge iz'ike di ọcha,

K'ayi jide onw'ayi namgb'onu;

K'ayi nwe aku n'uzọ di nsọ,

Aru n'obi zur'oke.


Verse 3

Wepu, na mba nka na mba dum,

Ihe nakpata odida;

Tinyua oku nke onwunwa;

Chughachi nd'iro-I azu.


Verse 4

 Nonyer'ayi, neny'ayi ike-Gi,

K'ayi wer'ike nadigh-anwu

Lugide nd'iro nke madu,

Guzọs'ike nim'ogu.


Verse 5

Ochi-agha-ayi mgbe nile,

Nedu ayi k'ayi nalus'ike;

Ka Nzuko-Gi zọput'uwa;

Ny'ayi ike n'amam-ihe.


Verse 6

Nna, Nke choro we choput'ayi;

Ọkpara, Nke hur'ayi n'anya;

Mọ Nsọ, Nke bi nim'obi-ayi;

Atọ nim'otu, nuru. Amen.

Abu 244- Nna, Nke si n'ulo-aku-Gi


Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.


We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.

.Site Credit: 9jainformed.com


إرسال تعليق (0)
أحدث أقدم