Abu 238- Tukwasi Chuku-i obi
Abu 238- Tukwasi Chuku-i obi |
Verse 1
Tukwasi Chuku-i obi!
Ga n'iru! ga n'iru!
Jidesie nkwa-Ya ike,
Ga n'iru!
Ajula aha nsọ-Ya,
Ma o weta ihere;
Nagbasa ude nke-Ya,
Ga n'iru!
Verse 2
Ọ kpotawo gi n'olu?
Ga n'iru! ga n'iru!
Jere Ya ozi ugbu a,
Ga n'iru!
Nefe Ya n'ihu-n'anya,
Nadabere'ike ya
Neguzọsike mgbe dum,
Ga n'iru!
Verse 3
Ọ nyewo i nkpuru ọma?
Ga n'iru! ga n'iru!
Kua, i gaghota ozo;
Ga n'iru!
Je n'on'uzọ Onye-nwe-i,
Nechere Ya n'eb'ahu;
Ọ ganu, za ekpere-i;
Ga n'iru!
Verse 4
Ọ siwo n'olu ebie?
Ga n'iru! ga n'iru!
Wer'egwu nsọ nefe Ya,
Ga n'iru!
Kraist bu oke-i na ike-i,
Ọ bu Nr'igwé n'uzọ-gi,
Ọ geduba i n'otuto:
Ga n'iru!
Verse 5
Na nwa mgbe ntakiri nka,
Ga n'iru! ga n'iru!
N'uzọ-i nile kwere Ya,
Ga n'iru!
K'uche-Ya di nime gi;
K'ochicho-Ya nato gi;
Nime ndu n'ipu-n'oru,
Ga n'iru? Amen.
Abu 238- Tukwasi Chuku-i obi
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com