Abu 224- Guzọ, guzọro Jisus

Abu 224- Guzọ, guzọro Jisus

 Abu 224- Guzọ, guzọro Jisus


Abu 224- Guzọ, guzọro Jisus
Abu 224- Guzọ, guzọro Jisus


Verse 1

Guzọ, guzọro Jisus,

Ndi-agha nke obe!

Bulie okoloto-Ya,

K'o ghar'ihu iyi.

Si na nmeri rue nmeri

Ọ gedu ndi'agha-Ya;

K'Ọ we kpochapu nd'iro,

Gho Ony'isi n'ezie.


Verse 2

Guzọ, guzọro Jisus!

Nuru uda opi,

Pua n'ok'ogu n'ubọchi

Nke otuto-Ya nka.

Unu ndi-dike, so Ya

Imegide nd'iro;

Ebe ih'ize-ndu di

K'ike-unu puta!


Verse 3

Guzọ, guzọro Jisus,

Nani n'ike nke-Ya!

Atukwasila obi

N'ike nk'anu-aru.

Yir'ih'agha Chineke,

Neche nche n'ekpere;

Eb'olu di m'ob'egwu,

Aghala ino ya!


Verse 4

Guzọ, guzọro Jisus!

Ogu gadi nw'oge;

Ta k'uzu-agha natu,

Echi b'abu nmeri

Onye nemeri emeri

Genwe okpu nke ndu;

Ọ gesso Ez'otuto

Bur'ez'ebigh-ebi! Amen.

Abu 224- Guzọ, guzọro Jisus


Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.


We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.

.Site Credit: 9jainformed.com


إرسال تعليق (0)
أحدث أقدم