Abu 223- Onye diri Jisus

Abu 223- Onye diri Jisus

 Abu 223- Onye diri Jisus

Abu 223- Onye diri Jisus
Abu 223- Onye diri Jisus

Verse 1

Onye diri Jisus,

Onye gef'Eze?

Onye genye aka

Kpota ndi ozo?

Onye garap'uwa,

Che nd'iro iru?

Onye diri Jisus

N'yere Y'ozi?


Kọrọs:-

Site n'olu'ebere,

N'amara-I di nsọ,

Ayi nadiri Jisus:

Jisus, ayi bu nke-I!


Verse 2

Ọ bugh n'ih'otuto

M'ob'okpu-eze,

K'ayi ji bata n'agha,

Nab'abu ogu;

Ma n'ihu-n'anya

Ọ ji nwuru ayi:

Onye Jisus kporo

Aghagh iso Ya.


Site n'ihu-n'anya,

N'amara-I di nsọ,

Ayi nadiri Jisus;

Jisus, ayi bu nke-I!


Verse 3

JIsus, o bugh ego

I ji gbaput'ayi,

Kama obara-ndu,

Ibu okp'eze-I.

Were ngọzi mejue

Ndi nabiakute I;

Gi mere k'ayi kwere,

Me k'ayi pua n'oru.


Site na ngbputa-I,

N'amara-I di nsọ,

Ayi nadiri Jisus:

Jisus, ayi bu nke-I!


Verse 4

Ogu gesi ike,

Nd'iro geri nne,

Ma h'apugh imeri

Ndi-agha nk'Eze.

Nmeri di n'okpuru

Okoloto-Ya;

Ayi aghagh imeri

N'ezi-okwu-Ya.


Onu k'ayi ji bilie;

N'amara-I di nsọ,

Ayi nadiri Jisus:

Jisus, ayi bu nke-I!


Verse 5

Ibu ndi-agha-Ya

K'aroputar'ayi,

Ndi Ony'isi agha

Tukwasir'obi;

K'ike ghar'igwu ayi

N'ilu-ogu-Ya;

Ayi ganu olu-Ya,

Ayi geme dinkpa!


Jisus, I gedeb'ayi

N'amara-I di nsọ!

Ayi gadiri Jisus:

Jisus, nke-I mgbe dum! Amen.

Abu 223- Onye diri Jisus


Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.


We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.

.Site Credit: 9jainformed.com


إرسال تعليق (0)
أحدث أقدم