Abu 221- Ony'ogu Kraist, bilie
Abu 221- Ony'ogu Kraist, bilie |
Verse 1
Ony'ogu Kraist, bilie
Yiri ih'agha-gi;
D'ike n'ike Chuku nenye
Site n'Ọkpara-Ya
Verse 2
D'ike nim'Onye-nw'ayi,
Nim'ike uku-Ya;
Onye tukwasiri Y'obi
Gabu onye-nmeri
Verse 3
Guzọ kwa n'ike-Ya
Yikwas'ike-Ya dum;
Chilie ih'agha nke Chuku
Guzọgide nd'iro.
Verse 4
K'ih'agha-gi di ọcha
Neche ya nche mgbe dum;
Naga n'iru Ony'isi-gi,
Nekpe kwa ekpere.
Verse 5
Si n'ike ba n'ike,
Lus'Ekwensu ogu;
Zoda ike ochichiri,
Buru onye-nmeri.
Verse 6
Mgb'i mesir'ihe dum
Mgbe ogu-gi gagwu,
I gemeri nani na Kraist,
Zue oke n'ikp'azu. Amen.
Abu 221- Ony'ogu Kraist, bilie
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com