Abu 22- Bianu, nd'okwukwe.
Verse 1
Bianu, nd'okwukwe,
N'onu nke di Ukwu,
Bianu, bianu, k'ayi je rue Betlehem;
L'Eze ndi-m'ozi,
Nke amuru n'uwa;
Bianu, k'ayi sopuru Ya,
Bianu, k'ayi sopuru Ya,
Bianu, k'ayi sopuru Ya, nu Eze Kraist.
Verse 2
Chuku, Nwa Chuku,
Ihe ebigh-ebi,
Le, Ọ leligh afo nke Nw'agboho;
Ezi Chineke,
Nke anekegh eke;
Bianu, k'ayi sopuru Ya,
Bianu, k'ayi sopuru Ya,
Bianu, k'ayi sopuru Ya, nu Eze Kraist.
Verse 3
Nd'abu ndi-m'ozi,
Buanu n'oke onu,
Buanu, unu ndi nile bi n'igwé;
Otutọ diri
Chineke n'el'igwé;
Bianu, k'ayi sopuru Ya,
Bianu, k'ayi sopuru Ya,
Bianu, k'ayi sopuru Ya, nu Eze Kraist.
Verse 4
Ayi ekele Gi,
Onye amuru ta;
Jisus, Otutọ nile diri Gi;
Okwu Chineke,
Onye ghoro madu;
Bianu, k'ayi sopuru Ya,
Bianu, k'ayi sopuru Ya,
Bianu, k'ayi sopuru Ya, nu Eze Kraist. Amen.
Abu 22- Bianu, nd'okwukwe
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com