Abu 218- Mgb'ebili-miri nke ndu namaghari i
Abu 218- Mgb'ebili-miri nke ndu namaghari i |
Verse 1
Mgb'ebili-miri nke ndu namaghari i,
Mgb'i neche n'ihe nile emebiwo;
Guk'otuto ngọzi-gi n'otu n'otu,
Olu Chineke luru geju i anya!
Kọrọs:-
Guko ngọzi-gi n'otu n'otu,
Guko, k'i hu olu Chineke!
Guko ngọzi, kpo ha ot'otu;
Olu Chineke luru geju i anya!
Verse 2
Ọ di mgbe ibu-obi nanyigbu gi?
Ob'enyere i k'i buru, o di aro?
Guk'ọtutu ngọzi-i, ich'uche gala,
I ganabu abu ka ubọchi ra!
Verse 3
Mgbe i huru aku n'ala ndi ozo,
Cheta n'ekwere i aku nk'igwé na nkwa;
Guko ngọzi-i; ego apugh izuta
Ugw'olu-gi n'ulo-gi nke di n'igwé.
Verse 4
Otu a n'etiti ogu nke uwa nka,
Ike agwula gi, Chineke b'eze!
Guk'otuto ngọzi-i; ndi-m'ozi no nsọ,
Ha ganyere i aka mgb'ije gagwu. Amen.
Abu 218- Mgb'ebili-miri nke ndu namaghari i
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com