Abu 216- Ka m'so Onye-nwem rida na ndagwurugwu
Abu 216- Ka m'so Onye-nwem rida na ndagwurugwu |
Verse 1
Ka m'so Onye-nwem rida na ndagwurugwu,
Ebe miri nke mara nma neru eru;
M'gesogide Jisus n'eb'o bula Ọ nedum,
Nazoso Ya rue mgbe m'gekpu okp'eze.
Kọrọs:-
Neso! neso! ka m'sogide Jisus!
Ebe dum Ọ nedum ka m'ganeso Ya!
Neso! neso! ka m'sogiode Jisus!
Ebe nile Ọ nedum ka m'geso Ya.
Verse 2
Ka m'so Onye-nwem rida na ndagwurugwu,
Ebe miri joro njọ, n'ok'ifufe di;
Ebe aka-Ya nedum apughm itu egwu:
Mgagh-at'ujo ih'ize-ndu m'Ọ no nsọ.
Verse 3
Nime ndagwurugwu m'obu n'elu ugwu,
Nkpur'obim gano nsọ Onye-nzọtam mgbe dum;
Ọ ganedum n'udo n'uzọ nk'Ọ zoro ukwu,
Rue n'ebe ha nezuko n'el'igwé-Ya. Amen.
Abu 216- Ka m'so Onye-nwem rida na ndagwurugwu
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com