Abu 195- Chukum, ka m'no nsọ Gi
Abu 195- Chukum, ka m'no nsọ Gi |
Chukum, ka m'no nsọ Gi,
Nodu nsọ Gi;
M'o buru kwa obe
Nke bulirim,
Abum nile gabu,
Chukum, ka m'no nsọ Gi,
Nodu nsọ Gi.
Verse 2
Ma m'di ka ony'ije
K'anwu dara;
Che isi na nkume,
Nezu ike;
Ma nime nrom nile,
Chukum, ka m'no nsọ Gi,
Nodu nsọ Gi.
Verse 3
K'uzọ yi ebube
Neru n'igwé;
Onyinye-Gi nile
Bu amara;
Ndi-m'ozi fem aka,
Chukum, ka m'no nsọ Gi,
Nodu nsọ Gi.
Verse 4
K'echichem tobe Gi mgbe m'tetara;
Site n'ihe-nwutam
M'gedo Bet-el;
Nime ahuhu nkem,
Chukum, ka m'nọ nsọ Gi,
Nodu nsọ Gi.
Verse 5
Ma m'geji nku ọńu
Felie n'ehi;
Anwu na kpakpando
Ka m'gechefu;
M'abum nile gabu,
Chukum, ka m'nọ nsọ Gi,
Nodu nsọ Gi.
Abu 195- Chukum, ka m'no nsọ Gi
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com