Abu 192- Ọ gabu na m'gerit'uru
Abu 192- Ọ gabu na m'gerit'uru |
Verse 1
Ọ gabu na m'gerit'uru
N'obara Onye-nzọputam?
Ọ nwurruum; onye mere
K'Ọ nwe ihe-ngbu, ga n'onwu!
Ihu-n'anya! o gadi'ana
Na Gi, Chinekem, ganwurum?
Verse 2
Ih'omimi! Okpar'anwua!
Onye gamata nzube-Ya?
N'efu ka ndi-m'ozi nanwa
Itu omim'ihu-n'anya.
Ebere! K'uwa sopuru!
Ndi-m'ozi, ajula ozo!
Verse 3
Ọ rapuru och'eze Nna-
Amara-ya nenwegh nsọtu-
Ọ mer'onwe-Ya ih'efu,
Gba obara n'ihi ndi-njọ.
Ebere! enyere n'efu;
Chinekem, o choputaram!
Verse 4
N'oge mbu mom eker'agbu
Togboro na njọ n'ochichi;
Ihe-I nwubara, m'we teta;
Ulo-nkporo juru n'ihe;
Nkporom dapuru, m'nwer'onwem,
Ebilirim, pua, soro Gi.
Verse 5
Atughm egwu ikp-omuma;
Jisos, n'ihe-Ya dum, bu nkem!
Adim ndu nime Ya: Isim;
Ezi'omume din so b'uwem.
N'ob'ike m'biarue ns'och'eze,
Nat'okpu-eze n'aka Kraist. Amen
Abu 192- Ọ gabu na m'gerit'uru
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com