Abu 187- Jisus, Ka m'kwere Gi, tukwasi I obim
Verse 1
Anom m'ikpo'omuma, I gagbaputam;
Ọ digh onye di ka Gi n'igwé, n'uwa:
Gi nwuru ndi-nmehie, Gi nwuru n'ihim!
Verse 2
Jisus, ka m'kwere Gi, Aha nk'ok'onu
Nke mo-ozi kwuru n'omumu nsọ-Gi;
Edere Ya n'elu obe-Gi mgbe dum:
Ndi-njọ gua, sopuru, nekwer'Aha-Ya.
Verse 3
Jisus, ka m'kwere Gi, necheta ndu-Gi
Juru n'ihu-n'anya ubọchi-Gi dum;
Ndi-nmehie no nsọ Gi, ndi-ekpenta bia-
M'amara-Gi ka ha nile natara.
Verse 4
Jisus, ka m'kwere Gi, n'Akwukwo Nsọ-Gi
Olu ebere-Gi ka m'nanu mgbe dum;
Mgbe Mọ Nsọ-I nez'ihe, o nadim utọ-
Nani ka m'nana nti, nano n'ukwu-Gi.
Verse 5
Jisus, ka m'kwere Gi, ghar'itu egwu:
I gagh-achupu onye nabiakute I;
Obara-I di ok'onu, nkwa-I neguzọ:
Ndia bu nzọput'obim, Gi bu Chinekem!
Amen.
Abu 187- Jisus, Ka m'kwere Gi, tukwasi I obim
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com