Abu 147- K'ora tobe ike Jisus
Abu 147- K'ora tobe ike Jisus |
Verse 1
K'ora tobe ike Jisus,
Ka ndi-m'ozi Ya da,
Weputa okpu nke eze,
Bia me Ya Ez'ora.
Verse 2
Me Y'Eze, ndi-ama Chuku
Neguzọ n'iru Ya;
To Ya, b'Onye unu soro,
Bia me Ya Ez'ora.
Verse 3
Umu Isreal arotara,
Ndi agbaputara,
Kelenu Onye-nzọputa,
Bia me Ya Ez'ora.
Verse 4
Ndi-njọ, ndi napugh ichefu
Olulu di ilu,
Nagbas'ak'unu n'ukwu-Ya,
Bia me Ya Ez'ora.
Verse 5
K'ebo nile n'asusu dum,
Naz'oku anakpo,
Bunye Ya ebube nile,
Bia me Ya Ez'ora.
Verse 6
K'ayi soro ndi nsọ bi n'igwé
Da n'ala n'ukwu-Ya,
Soro n'abu ebigh-ebi,
Bia me Ya Ez'ora. Amen.
Abu 147- K'ora tobe ike Jisus.
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com