Abu 128- Were ndum, Nna, k'o buru.
Verse 1
Were ndum, Nna, k'o buru
Ih'edoro nsọ nye Gi;
Were ubochim nile,
Ka ha neru n'otuto.
Verse 2
Wer'akam ka ha neme
K'ihu-n'anya-Gi si cho;
Were ukwum, me ka ha
Di nfe n'ije-ozi-Gi.
Verse 3
Were olum, ka m'nabu
Abu nye nani Ezem;
Were irem, me k'o jue
N'ozi ọma si na Gi.
Verse 4
Were akum na egom,
Ọ nwegh nke gafodurum;
Were uchem n'ikem dum,
Me ka o si di Gi nma.
Verse 5
Wer'ochichom, me ya nke-I,
Ọ gagh-abu nkem ozo;
Were obim: Gin we ya,
Ọ gabu och'eze-Gi.
Verse 6
Onye-nwem, ihu-n'anyam
Ka m'togboro n'ukwu-Gi;
Wer'onwem, agambu
Nani nke-Gi mgbe nile. Amen.
Abu 128- Were ndum, Nna, k'o buru.
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com