Abu 117- Bia n'okukwe nar'aru Onye-nwe-I.
Verse 1
Bia n'okukwe nar'aru Onye-nwe-I,
Nua obara-nsọ-Ya nk'Ọ wusiri.
Verse 2
Aru n'obara-Ya zọputar'ayi,
Obi di ndu k'ayi ji kele Chuku.
Verse 3
Kraist, Nwa Chineke, Onye-nzọputa,
Site n'onwu-Ya n'obe nwe nmeri.
Verse 4
Achuru Ya n'ihi madu nile,
Ya b'Onye-nchu-aja, n'anu aja.
Verse 5
Iw'ochie ji anu achu aja,
Nenomi ihe-omimi nk'igwé.
Verse 6
Jisus, Onye-ngbaputa na ihe,
Ji amara nyere ndi nsọ aka.
Verse 7
Werenu obi ezi-okwu bia,
Nar'ihe-mbe nke nzọputa n'ebe a.
Verse 8
Onye nechebe ndi nsọ-Ya n'uwa,
Nenye ndi kwere ndu ebigh-ebi.
Verse 9
Nri nk'igwé k'Ọ nenyejundi-agu,
Nye obi nke nachomiri nke ndu.
Verse 10
Ony'ikpe uwa, Onye-nzọput'ayi,
N'oriri ihu-n'anya-I nonyer'ayi ! Amen
Abu 117- Bia n'okukwe nar'aru Onye-nwe-I.
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com