Abu 111- Chukum, nara nkpur'obim ta.
Verse 1
Chukum, nara nkpur'obim ta,
K'Ọ buru nke-I mgbe dum;
Ka m'ghar'irapu Gi kpafue,
Ghar'idaghach'azu.
Verse 2
N'iru obe nk'Onye nwuru,
Le, ka m'gbur'ikpere;
Kwe k'akpogbue nmehie nile,
Ka Kraist bur'ihe dum.
Verse 3
Tem manu amara nk'igwé,
Me kwa ka m'buru nke-I;
Ka m'hu iru otuto-Gi,
Fe Gi n'och'eze-Gi.
Verse 4
K'echiche, n'olu n'okwu dum
Buru nke-Gi mgbe dum;
Jisus, ka m'were ndum fe Gi;
Onwu gab'uz'igwé ! Amen.
Abu 111- Chukum, nara nkpur'obim ta.
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com