Abu 98- Chuku, ayi abia ugbua.
Verse 1
Chuku, ayi abia ugbua,
N'ukwu-I k'ayi gbur-ikpere;
Akpapula aririo,
Ayi garioro Gi n'efu?
Verse 2
Gi k'ayi tukwasir'obi,
Wer'ebere ridata;
Meju'obi-ayi n'amara,
Me k'onu-ayi neto Gi.
Verse 3
N'uzọ nke I doziri
Ayi biara ichota Gi;
Chuku, ezipula ayi,
Ghara inye ayi ngọzi.
Verse 4
Site n'ozi-ọma-Gi
Zite okw'udo n'onu;
Ka Mọ-Gi ny'obi nile
Nzọputa-Gi zur'oke.
Verse 5
Kasie obi ner'uju,
K'oge onu laghachi;
Palie ndi-Gi dar'ada,
Nye ha okwukwe d'ike.
Verse 6
Kwe k'yi nile choputa
Gi, bu Onye-ebere:
Gwo ndi-oria nile nk'ayi
Zilag'ayi n'onu nke-Gi.
Abu 98- Chuku, ayi abia ugbua.
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com