Abu 93- Nka b'ubọchi Chuku doro.
Verse 1
Nka b'ubọchi Chuku doro,
Ọ kpo y'oge nke-Ya;
K'igwé n'ala nuria n'otu,
Neto Ya n'och'eze.
Verse 2
Ta k”o si n'onwu bilite,
Ik'Ekwensu ada;
Ta ka ndi nsọ to nmeri-Ya,
Nekwusa ike-Ya.
Verse 3
Hosanna diri Eze-ayi,
Ọkpara nsọ Devid!
Yer'ayi aka, si n'oche-Gi
Wetar'ayi nzọputa.
Verse 4
Ngozi diri Ony'ahu ji
Ozi nk'amara bia;
Nke nabia n'aha Chineke
K'Ọ zọputa ndi-njọ.
Verse 5
Hosanna ! otuto kasi
Nzuko nk'uwa genye;
Elu-igwé, eb'Ọ nachi,
Geto Ya kari nka. Amen.
Abu 93- Nka b'ubọchi Chuku doro.
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com