Abu 7- Le, k'obi'ahu gesi di'ọcha
Verse 1
Le, k'obi'ahu gesi di'ọcha
Nke nabia n'iru-Gi;
Nelekwaswi ihe nsọ-Gi,
Naṅuri ọnu n'obi n'obi'utọ
N'iru Gi, Chineke.
Verse 2
Mọ ndi nọ nsọ och'eze-Gi
Nenwe ọnu ahu;
Ọ bu nani ha mara ya,
Ebe ha namaghkwa nmehie,
Ha adagh kwa ada.
Verse 3
M'gesi ana, mu b'onye-njọ,
Ony'obi gbachiri,
Bia n'iru Ya, Nke di egwu,
Mọ nkem gesi ana hu Ya:
Ih'anakegh eke!
Verse 4
Uzọ di ayi gesi bilie
Ba nim'ihe ahu:
Otu Aja nke zur'ezu,
Ike Mọ Nsọ Ony'amara,
Ọnu-nekwuru-ayi.
Verse 5
Ọ bu ndia nakwadebe ayi
Iru ebe-nsọ-Gi,
Umu ochichiri na njọ
Gebi n'ihe ebigh-ebi
Site n'ihu-n'anya-I. Amen
Abu 7- Le, k'obi'ahu gesi di'ọcha
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com