Abu 51- Kel'ubọchi nrigo-Ya.
Verse 1
Kel'ubọchi nrigo-Ya Haleluya!
Anapuru Ya n'any'ayi; Haleluya!
N'uwa nka k'Ọ bi nw'oge, Haleluya!
We rigo kwa n'igw'ozo. Haleluya!
Verse 2
Onu-agha neche Ya, Haleluya!
Meghe on'uzọ igwé; Haleluya!
K'Eze ebube bata! Haleluya!
Ọ meriw'onwu na njọ. Haleluya!
Verse 3
N'el'igwé k'Ọ rigoro, Haleluya!
Ma Ọ hur'uwa n'anya; Haleluya!
Ọ no n'oche-eze-Ya, Haleluya!
M'Ọ nakpo madu ndi-Ya. Haleluya!
Verse 4
Le! Ọ chilie aka-Ya, Haleluya!
Gosi apa-ntu di ha; Haleluya!
Ge nti! nuru olu-Ya, Haleluya!
K'Ọ nagozi Nzuko-Ya. Haleluya!
Verse 5
Ayi na Gi gano n'igwé, Haleluya!
Doro Gi nabu eze; Haleluya!
Nahu iru-Gi mgbe dum, Haleluya!
Chota onu-ayi na Gi. Haleluya! Amen.
Abu 51- Kel'ubọchi nrigo-Ya.
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com