Abu 45- Jisus di ndu! gi, onwu.
Verse 1
Jisus di ndu! gi, onwu,
I pugh ime k'ayi tua egwu;
Jisus di ndu! gi ill,
I pugh ime k'ayi bur'oru.
Haleluya!
Verse 2
Jisus di ndu! rue ugbu a
Onwu bu on'uzọ nke ndu;
Nka gewepu egwu-ayi
Mgb'ayi gagabiga uzọ-ya.
Haleluya!
Verse 3
Jisus di ndu! Ọ nwur'ayi:
K'ayi diri nani Jisus ndu;
K'ayi biri n'obi ọcha,
Neto Onye-nzọputa-ayi.
Haleluya!
Verse 4
Jisus di ndu! ayi mara
Ọ digh ihe gekewp'ayi;
Ndu, Onwu na Ekwensu,
H'apugh inap'ayi n'aka -Ya.
Haleluya!
Verse 5
Jisus di ndu! ewere
Oche-eze nile nye Ya;
Ayi pur'iru eb'Ọ no,
So Ya buru eze n'igwé.
Haleluya! Amen.
Abu 45- Jisus di ndu! gi, onwu.
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com