Abụ 394. Chukwu dị nsọ, ayị ekele I
Abụ 394. Chukwu dị nsọ, ayị ekele I |
Verse 1
Chukwu dị nsọ, anyị ekele I
Ka I si we nagb’ayị ume,
Nye kwa’ayi arụ ike na nka
Ayị ji lụ ọlụ ubi ayị.
2. Anyị nekelekwasị Gị, Nna,
N’ihi ike nk’I nyere anyị
Iwe owuwe ih’ubi,
N’ọṅụ, n’udo, n’arụ-ike.
3. Ugbu a bụ oge oriri,
Obi’ụtọ k’anyị ji zukọta
Ịrịọ Gị k’I nọnyere anyị
N’it’egwu, n’oriri, n’ọṅụ.
4. Otuto niile dịrị Nna,
Dị-kwa-r’Ọkpara Ya dị nsọ,
Na Mọ Nsọ, ezi Onye-ndu,
We rue n’ụwa ebigh-ebi. Amen.
Abụ 394. Chukwu dị nsọ, ayị ekele I
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com
.Site Credit: 9jainformed.com