Abu 369- Chineke bu Ony'Okike
Abu 369- Chineke bu Ony'Okike |
Verse 1
Chineke bu Ony'Okike;
O kere ihe dum;
N'igwe nile n'uwa nile
K'agahu olu-Ya.
Verse 2
K'ayi gua ihe ole-n'ole
N'etiti olu-Ya;
N'ihi n'ebigh-ebi ezugh
Iguko ha nile
Verse 3
Na mbu O si, “Ka ihe di”:
Ma, le, ihe we di;
O kere mbara el'igwe,
Ke kwa al'akoro.
Verse 4
O kere osisi nile
Nke di nim'ok'hia,
Yikwasi ha nma dik'uwe
Na mkpuru di'ich'iche.
Verse 5
Lekwasi anyanwu anya,
Onwa, na kpakpando:
I gatu egwu-Ya kari,
Bu Chukwu-Okike.
Verse 6
O ker'anu nakpu akpu,
N'an'ufe di n'elu;
O kpu'olu-Ya okp'eze
Site n'ikpu madu.
Verse 7
Madu nka k'O yikwasiri
Nghota n'amam-ihe,
Ka madu we me uche-Ya,
Bu Onye kere Ya.
Verse 8
K'uwa rapu npako-ya, we
Sopuru Chineke,
K'o we diri ya nma ugbu a,
We rue mgb'ebigh-ebi. Amen.
Abu 369- Chineke bu Ony'Okike
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com
.Site Credit: 9jainformed.com