Abu 341- Nna nk'amara, nonyer'ayi ta
Abu 341- Nna nk'amara, nonyer'ayi ta |
Verse 1
Nna nk'amara, nonyer'ayi ta;
Ulo nka k'ayi nedo nsọ nye I;
Biko, Nna, to nti-Gi n'a la
Nur'olu ekpere ndi-Gi.
Verse 2
K'udo nsọ nebi nime ya,
N'ihu-n'anya, n'ezi-okwu;
K'obi di aro nwe nkasi
N'amara-Gi di ok'onu.
Verse 3
K'anu olu ony'aririo,
K'ony'ike gwuru zur'ike;
K'onye nakwa njọ Gi,
Ndi nechere I nata ngọzi.
Verse 4
Mgb'ananu ozi'ọma n'ebe a,
Mgb'anekwusa Aha-nzota,
K'atute obi nwur'anwu,
Ọ we di ndu, nenwu k'oku.
Verse 5
Ka ndi dara ogbi nabu,
Ndi nti chiri nanu ihe;
Nye ndi di um'ala n'obi
Ngbahara n'onodu egwu.
Verse 6
Nna, me k'ulo nka buru nke-I,
K'achota ru-Gi n'ebe a;
K'o bur'ul nke Chineke,
On'uzọ el'igwé n'ezie. Amen.
Abu 341- Nna nk'amara, nonyer'ayi ta
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com
.Site Credit: 9jainformed.com