Abu 337- Kraist bu Nto-ala-ayi
Abu 337- Kraist bu Nto-ala-ayi |
Verse 1
Kraist bu Nto-ala-ayi,
Ayi newu n'elu Ya;
Nani ndi nsọ nke-Ya
Neju ulo nk'igwé;
Ọ nenye ayi olil'anya
Nk'ike n'uwa, n'onu n'elu.
Verse 2
K'abu nke otuto
Nada n'ulo nsọ nka;
Ayi geweli olu
To Atọ nim'otu;
Wer'abu onu nekwusa
Aha otuto-Ya mgbe dum.
Verse 3
N'ebe a, Nna nk'amara,
Nabia nsọ ayi mgbe dum;
Nara nkwa nsọ nile,
Nuru aririo-ayi;
Were ngọzi wukwasi ndi
No n'ekpere n'ubọchi nsọ.
Verse 4
N'ebe a k'ayi nariota
Amara si n'igwé;
Kwe k'amara ahu
Diyer'ayi mgbe nile;
We rue mgbe ndi-ngọzi nile
Gala n'igwé, we zue ike. Amen.
Abu 337- Kraist bu Nto-ala-ayi
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com
.Site Credit: 9jainformed.com