Abu 331- Gi, onye ndi no nim'oria
Abu 331- Gi, onye ndi no nim'oria |
Verse 1
Gi, onye ndi no nim'oria
Biakutere mgbe nile,
K'okwu-ngwoputa-Gi naza
Akwa nke ndi no na ngbu.
Nuru, Jisus, m'ayi nario
Aririo n'och'ebere-I.
Verse 2
Ndi nanwu, ndi nenwegh ike,
Nacho iny'aka-Gi
K'ayi me k'ibu-ha di nfe,
Necheta ha mgb'ayi nario
Aririo n'och'ebere-I.
Verse 3
Ka nwa-Gi o bula kwere
Iji aka n'obi-ya,
nemez'iwu ihu-n'anya,
Nakasi obimgbe dum;
nebute ih'onyinye
N'aririo n'och'ebere-I.
Verse 4
Ka nmehie, oria, n'ahuhu,
Chota ngopu nime Gi;
Rue mgbe ndi-oria ganuri
N'agworo ha, sacha ha.
Ha genwekongbaputa,
Zuko kwa n'och'ikpe-Gi. Amen.
Abu 331- Gi, onye ndi no nim'oria
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com
.Site Credit: 9jainformed.com