Abu 322- Ayi nenye I ihè-Gi
Abu 322- Ayi nenye I ihè-Gi |
Verse 1
Ayi nenye I ihè-Gi;
Onyinye o bula;
Ihe dum ayi nwere bu nke-I,
Iji lua olu-Gi.
Verse 2
K'ayi nara ngọzi-Gi
Dik'ezi ndi-oru;
K'ayi wer'onu nyeghachi Gi
Nkpuru-mbu nk'I nyere.
Verse 3
Obi di nke nwuru,
Ulo togbo n'efu,
N'aturu Jisus nwururu
Nefughari n'uwa!
Verse 4
Ikasi, n'igọzi,
Ich'ogwu ahuhu,
Ilekota ndi-ogbenye:
B'olu m'ozi n'uwa!
Verse 5
Itopu ndi-nmehie,
I cho ndi fur'efu,
Izi uzọ nke ndu n'udo:
Bu ime dika Kraist!
Verse 6
Ayi kwere okwu-Gi,
N'okwukwe-ayi di nta:
Ih'ayi mere ndi nke-Gi, Kraist,
Ayi mere ha nye Gi! Amen.
Abu 322- Ayi nenye I ihè-Gi
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com
.Site Credit: 9jainformed.com