Abu 32- Ugwu di n'ebe di anya.
Verse 1
Ugwu di n'ebe di anya,
N'azu ot'obodo,
Ebe akpogburu Jisus,
Nke nwuru n'iayi.
Verse 2
Ayi apugh iko akuku
Ihe-nwuta nke-Ya;
Ayi kwere n'o bu n'ihi ayi
K'Ọ huru ahuhu.
Verse 3
Ọ nwuru k'agbahara ayi,
K'ayi we gho ndi ọma,
K'ayi la n'igwé n'ikpe-azu,
N'ike obara-Ya.
Verse 4
Ọ digh onhye ozoz puru
Ikwu ugwo nke njọ;
Nani Ya pur'imegh'uzọ
Nke igwé, k'ayi bata.
Verse 5
Ọ huru ayi n'anya nk'ukwu;
Ayi gahu-kwa-ra Ya,
Tukwas'obi n'obara-Ya,
Nalu olu nke-Ya. Amen.