Abu 312- N'anyasi, tut'anwu ada
Abu 312- N'anyasi, tut'anwu ada |
Verse 1
N'anyasi, tut'anwu ada,
Jisus, ndi-oria nonyere I;
Ha zukotara n'ihe-ngbu
Ha lara n'ulo n'ok'onu.
Verse 2
Ọ bu mgbe anyasi ugbu a,
Ihe-ngbu k'ayi ji biakute I;
Ayi ahugh udi-Gi anya,
N'ayi mara n'I nonsọ n'ebe a.
Verse 3
Jisus, chupu ahuhu-ayi;
Ufodu no n'oria na nkpa;
Ndi'ozo akahugh Gi n'anya;
Ihu-n'anya ndi'ozo nwuru.
Verse 4
Ufodu chotara n'uwa
B'efu, ma ha arapugh ya;
Nyi ndi'ozo newuta ha,
Ma h'achogh k'I bur'Enyi-ha.
Verse 5
Ọ digh onye nwer'ezi'udo,
Mgbe njọ metur'ayi nile;
Ndi nacho ife Gi nk'ọma
K'obi nata uta keri.
Verse 6
Onye-nw'ayi, I ghoro madu;
Anwara Gi n'uzọ nile;
Anya obi'ọma-Gi nahu
Onya nk'ihere chor'izo.
Verse 7
Ike-Gi di kua k'o diri;
Ọ digh okwu-I nke bu n'efu;
Nuru na mgbe anyasi nka,
Wer'ebere-I gwo ayi nile. Amen.
Abu 312- N'anyasi, tut'anwu ada
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com
.Site Credit: 9jainformed.com