Abu 311- Anwu nk'obim, Onye-nzọtam
Abu 311- Anwu nk'obim, Onye-nzọtam |
Verse 1
Anwu nk'obim, Onye-nzọtam,
Abal'adigh ma I no nsọ;
Ekwela igw'oji nk'uwa
zọpu Gi n'anya nk'oru-Gi.
Verse 2
Mgbe ura ji nwayọ natu
Anyam abua ike gwuru,
Ka m'necheta n'o di utọ
Izu nk'obi Jisus.
Verse 3
Nonyerem na mgbe ehihie:
M'obugh Gi, apughm idi ndu;
Nonyerem mgb'anyasi nabia,
Achogm inwu ma I nogh nsọ.
Verse 4
Ọ di nwa-Gi kpafuru ta,
Nekwegh inu olu nsọ-Gi?
Jisus, malite olu-Gi;
Ekwela k'o dina na njọ.
Verse 5
Chebe nd'oria, nye nd'ogbenye
Ngozi si n'ulo-aku-Gi;
K'ura nke ndi ner'uju ta
Di utọ k'ura nke nwata.
Verse 6
Bia, gozie ayi mgb'ayi tetara,
Tutu ayi eje ije-ayi;
Rue mgbe ayi geru n'el'igwé,
Biri n'ok'ihu-n'anya-Gi. Amen.
Abu 311- Anwu nk'obim, Onye-nzọtam
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com
.Site Credit: 9jainformed.com