Abu 310- Chineke, otuto diri I
Abu 310- Chineke, otuto diri I |
Verse 1
Chineke, otuto diri I
N'ihi ngọzi nile nke ta;
Biko, chebem, Eze nk'igwé,
N'okpuru nku-Gi di ike.
Verse 2
Gbagharam, n'ihi Ọkpara-I,
Ihe ojo nke m'mere ta;
Ka tutu mu arar'ura
Mu na Gi n'uwa di n'udo.
Verse 3
Zim idi nndu, k'egwu onwu
Ghar'itum kar'ihe-ndinam;
Zim ka m'gesi nwu, ka m'bilie
N'otuto n'ubọchi ikpe.
Verse 4
Biko, k'obim dabere Gi,
K'ura utọ mechie anyam:
Ura geme k'arum d'ike
Ife Chukum mgbe m'tetara.
Verse 5
N'abnali mgbe ura natughm,
K'echiche nk'igwé ju obim;
K'ajo nro ghara isogbum,
M'obu ike nk'ochichiri.
Verse 6
To chineke, Onye-ngọzi;
To Ya, ihe nile n'uwa;
To Ya, usu nile nk'igwé;
To Nna, n'Ọkpara, na Mọ Nsọ. Amen.
Abu 310- Chineke, otuto diri I
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com
.Site Credit: 9jainformed.com