Abu 306- Nonyerem: o rubewo anyasi
Abu 306- Nonyerem: o rube wo anyasi |
Verse 1
Nonyerem: o rube wo anyasi;
Ochichi nagba: Jisus, nonyerem;
Mgb'inye-aka na nkasi gwusiri,
Gi, Inye-aka nkem, bia nonyerem.
Verse 2
Ubochi ndu-ayi nagafe ngwa ngwa,
Onu n'otuto nk'uwa nka nefe;
Ngbanwe n'ure di n'akuku nile:
Gi, Onye nenwegh ngbanwe, nonyerem.
Verse 3
Abiala n'egwu, dik'Eze nk'igwé;
Kama, bia n'obi'ọma igw'oria dum;
Gi, Onye-nkasi-obi n'ahuhu,
Enyi nke ndi-nmehie, bia nonyerem.
Verse 4
Ọ dim nkpa k'I nonyerem mgbe nile,
Nani amara-I ganyi Ekwensu;
Onye dika Gi gabu Onye-ndum?
N'udu-miri n'okochi, nonyerem.
Verse 5
M'I nonyerem m'gagh-at'ujo nd'iro;
Nsọgbu n'anya-miri adigh ilu;
Onwu, ole ebe nmeri-gi di?
Anom nemeri ma Gi nonyerem.
Verse 6
Gosim obe-I mgbe m'gekpuchi anyam,
Nenwu na ngbachi, zim uzọ nk'igwé
Ch'igwé nabo, onyinyo uw'aga:
Na ndu, n'onwu, Onye-nwem, nonyerem. Amen.
Abu 306- Nonyerem: o rube wo anyasi
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com
.Site Credit: 9jainformed.com