Abu 29 -Otu mgbe n'obodo Devid.
Verse 1
Otu mgbe n'obodo Devid
Otu ulo anu di,
Eb'otu Nwanyi nyibere
Nwa-ya o muru ohu;
Meri bu nne om'ahu,
Jisus Kraist bu Nwa nke-ya.
Verse 2
Ọ si n'igwé rida n'uwa,
Onye bu Chineke-ayi;
Ulo anu zere Ya ndu,
Ọ dina n'ebe ahu;
Nd'ogbenye ndi di ala
Ka Jisus-ayi binyere.
Verse 3
Mgbe nile Ọ dina nwata
Ọ ji nsọpuru nanu
Okwu nwanyi nke muru Ya,
Nke kuru Ya n'aka-ya;
Umu-nta Jisus geme
Ez'omume dika Ya.
Verse 4
Ya bu Onye ayi genomi,
Ọ toto dik'ayi si eto,
Ọ dichasi otu ayi di,
Ọ mara akwa n'ochi;
Nwuta-ayi newuta Ya,
Ọṅu-ayi bu kwa nke-Ya.
Verse 5
M'emesia any'ayi gahu Ya,
Site n'ihu-n'anya-Ya;
N'ihi na Nwata ọma nka
Bu Eze-ayi n'el'igwé;
Ọ nedu umu nke-Ya
We rue n'eb'ahu Ọ no. Amen.
Abu 29 -Otu mgbe n'obodo Devid.
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com