Abu 279- Jisus Kraist hurum n'anya
Abu 279- Jisus Kraist hurum n'anya |
Verse 1
Jisus Kraist hurum n'anya!
Bible Nsọ nagwam otu a;
Umu-nta bu ndi nke-Ya;
H'adigh ike' m'Ọ d'ike.
Kọrọs:-
Ọ hurum n'anya!
Ọ hurum n'anya!
Ọ hurum n'anya!
Bible nagwam otu a.
Verse 2
Jisus Kraist hurum n'anya!
Ọ nwuru k'Ọ megh'igwé;
Ọ gasachapu nmehiem,
Kwe ka nwa-nta-Ya bata.
Verse 3
Jisus Kraist hurum n'anya!
Mgb'ike gwurum na'nririam;
Ọ gesi n'och'eze-Ya
Bia chebem n'ebe m'dina.
Verse 4
Jisus Kraist hurum n'anya!
Ọ gano nsọm n'uzọm dum;
Ma m'hu Ya n'anya n'ezie,
Ọ gakpolagam n'igwé. Amen.
Abu 279- Jisus Kraist hurum n'anya
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com
.Site Credit: 9jainformed.com