Abu 273- Bianu, ndi-nmehie fur'efu
Abu 273- Bianu, ndi-nmehie fur'efu |
Verse 1
Bianu, ndi-nmehie fur'efu,
Ndi'ogbenye nadigh ike:
Jisus nachọ izop'unu,
I juru n'ihu-n'anya.
Ọ di ike,
Ọ kerewo: bianu ta!
Verse 2
Me ngwa, bianu, ndi nkpa nakpa,
Nar'ebere Chineke;
Ezi ncheghari, n'okwukwe,
N'onyiny'amara nile,
Bianu, nara
N'aka Jisus Kraist n'efu!
Verse 3
Ekwela ka ako-n'uche
Me ka unu ghar'ibia;
Nani nkwesi nka k'o nachọ,
Bu ka nkpa-Ya nakp'unu;
Nka k'Ọ nenye i,
Ọ bu onyinye Mọ-Ya.
Verse 4
Bianu, unu nd'ike gwuru,
Ndi odida rur'aru;
M'unu chere k'unu di nma
Ọ digh mgbe unu gabia.
Jisus nakpo
Ndi njọ, o bugh ndi ọma!
Verse 5
Le, Onye rigoro n'igwé
Ji obara-Ya nario;
Tukwasi Ya obi-unu,
Atukwasil'ony'ozo.
Nani Jisus.
Verse 6
Ndi nsọ na ndi-m'ozi nile
Neto Nw'aturu Chuku;
N'eb'obibi nile n'igwé
Ude aha-Ya nada.
Haleluya!
Ndi-njọ geto Ya n'uwa! Amen.
Abu 273- Bianu, ndi-nmehie fur'efu
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com
.Site Credit: 9jainformed.com