Abu 269- Ony'obia no n'on'uzọ
Abu 269- Ony'obia no n'on'uzọ |
Verse 1
Ony'obia no n'on'uzọ:
K'Ọ bata!
Ọ nabia site na mbu:
K'Ọ bata!
K'Ọ bata tutu Ọ la,
K'Onye Nsọ ahu bata,
Jisus Kraist, Ọkpara Nna:
K'Ọ bata!
Verse 2
Meghe obi-gi nye Ya:
K'Ọ bata!
Ọ gala mgb'i nechere:
K'Ọ bata!
K'Ọ bata: Ọ bu Enyi-i,
Ọ galuru gi ogu,
Ọ gechebe i mgbe nile:
K'Ọ bata!
Verse 3
Ge nti olu-Yaa ugbu a!
K'Ọ bata!
K'Ọ bur'Ony'i rotara:
K'Ọ bata!
Ọ neguzọ n'on'uzọ,
Ọ genye gi onu-Ya;
I ganeto Aha-Ya:
K'Ọ bata!
Verse 4
Kpobata Obia nk'igwé:
K'Ọ bata!
Ọ gemere i oriri:
K'Ọ bata!
Ọ gagbahara njọ-gi;
Mgbe ndu-i n'uwa nka gagwu
Ọ gekurui la n'igwé:
K'Ọ bata! Amen.
Abu 269- Ony'obia no n'on'uzọ
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com
.Site Credit: 9jainformed.com