Abu 24- Dika nd'ochie ji onu
Verse 1
Dika nd'ochie ji onu
Hu kpakpando duru ha;
Wer'onu so ihe-ya,
Nk'o ji nedu ha n'uzọ;
Kwe, nn'ayi, ka esi otu a
Duru ayi biakute Gi.
Verse 2
Otu ha ji onu ga
We rue n'ebe Jisus no;
Gbue ikpere n'iru Ya,
Ony'igwé n'uwa neto;
Otu a me ka ukwu-ayi
Ga rue och'ebere-Gi.
Verse 3
Otu ha nyer'onyinye
Nke di ok'onu-ahia;
Otu a k'ayi were onu,
Nke njọ n'aghugho nadigh,
Weta aku-ayi nile,
Nye Gi, kraist, Eze nke-ayi.
Verse 4
Jisus di nsọ, kw'ubọchi
Deb'ayi n'uzọ nkpagide;
Mgbe ihe uwa gafe,
kpobat'obi-ayi n'ebe
Kpakpando agagh-edu,
Eb'ebube-Gi nenwu.
Verse 5
N'obodo omank'igwé
ha achogh ihe nk'uwa;
Gi b'ihe na Ọnu-ya,
Gi Anwu namu mgbe dum;
N'eb'ahu ayi ganabu,
Neto Ez'ayi mgbe nile. Amen.
Abu 24- Dika nd'ochie ji onu
Abu Igbo Anglican Communion is hymns composed in Igbo language which can be found in Ekpere na Abu. The hymns are number 1 to 400.
We have devoted this blog to listing out the complete Igbo one by one. Feel free to use and share. Sing unto the Lord.
.Site Credit: 9jainformed.com